[Unicode]  Gịnị bụ Yunikod (Unicode)? Home | Site Map | Search
 

Gịnị bụ Yunikod (Unicode)?

Yunikod(Unicode) na-eme ka enwee ọnụ-ọgugụ pụrụ iche maka mkpụrụ-okwu ọbụla.
Na-agbanyeghị ụdị kọmputa eji ede ihe.
Na-agbanyeghị ụdị nka-ụzụ-igwe ma ọbụ programụ eji ede.
Na-agbanyeghị ụdị asụsụ mmadụ nwere.

 

N'ịkpa isi-okwu, kọmputa dum, ma ọ bụ igwe-mgbakọ-omekọba ọbụla, bụ nanị ọnụ-ọgụgụ ka ha ji emepụta ihe. Ha na-ejigide mkpịsị okwu n'onwe ha nakwa mkpụrụ-okwu ndị ọzọ site n'itụnyere ha ọnụ-ọgụgụ n'otu n'otu.Tutu ụwa echepụta Yunikod(Unicode) n'atụmatụ, e nwere ọtụtụ ụdị atụmatụ ndị ọzọ di iche iche eji ọnụ-ọgụgụ na-ede kama o nweghị otu n'ime atụmatụ ndị a nwezuru mkpụrụ-okwu eji eme edemede n'asụsụ mba dum. N'iji we maa atụ, ndị mba Yurop dịkọd’ọnụ n'onwe ha jiri atụmatụ ole na ole na-akwado ma deekwa asụsụ ha dị iche iche. Ọbụna abịa n'ime asụsụ kwụrụla onwe ya, dịka Oyibo ma ọ bụ n'asụsụ ndị Bekee akpọrọ English, o nweghị atụmatụ ọbụla dị mma nke ejiri kpokọta mkpụrụ-okwu ha dum n'otu. Ma rịkọm 'elu na ala' n'edemede ha, ma akara-enyo na nka-edemede ha n'ile ndị ụmụ-ala ha dum ji e-de ihe.Atụmatụ ndị a n'ile nọkwa n'asọrọmpi n'etiti onwe ha. Ya bụ, ụfọdụ oge, atụmatụ abụọ nwere ike jiri otu ọnụ-ọgụgụ kwado mkpụrụ-okwu abụọ dị iche. Nwekwaa ike jiri ọnụ-ọgụgụ abụọ dị iche were kwado otu mkpụrụ-okwu. Kọmputa ọbụla (tụmadụ ndị a eji akwado ogwe-igwe-ikuku akpọrọ Ịntanet) kwesịrị ka ha kwado atụmatụ dum dị iche iche ụwa ji edepụta ihe; kama oge ọbụla atụmatụ abụọ ọbụla na-akparịta ụka n'ime onwe ha ma ọ bụ mgbe edemede-okwu ma ọ bụ ahịrị-nkata dị an̄aa si na atụmatụ otu kọmputa gafee na nke ọzọ, ihe dị iche na-apụtakarịị wee ghọrọ ihe a na-atụghị anya ya kpam-kpam. Nkea wee bụrụ ihe mba elu uwa dum na-achọghị.

Yunikod(Unicode) na-agbanwe ihe ndịa dum!

Yunikod(Unicode) na-eme ka ọnụ-ọgụgụ pụrụ iche dinyere mkpụrụ-okwu ọbụla, na-agbanyeghị ụdị igwe-omekọba ma ọ bụ kọmputa nke a-nọ n'elu ya, ma ọ bụ nka-igwe ejiri na-emepụta ihe ma ọ bụ asụsụ ndị eji were na-eme ihe n'elu ha. Atụmatụ Yunikod(Unicode) bụ ọkọlọtọ nke ụwa dum maara ma narakwa. Ndị dịka Apple, HP, IBM, JustSystems, Microsoft, Oracle, SAP, Sun, Sybase, Unisys bụ aha ndị ọkacha-eme na nka-ụzụ-igwe na-akwado ya, tinyerekwara ndị ọzọ. Yunikod(Unicode) bụ isi ihe ọkọlọtọ ndị ọzọ nọ n'ụwa kịtaa chọọrọ dịka XML, Java, ECMAScript (JavaScript), LDAP, CORBA 3.0, WML … (echetera m na echeteghị m). Ọ bụkwa ọkpụrụ-ihe e ji wee mee ka atụmatụ mba elu ụwa ISO/IEC 10646 were kwụrụ chịm! A kwadokwara Yunikod(Unicode) n'ime ngalaba igwe-mgbakọ-omekọba dị iche iche, nakwa nka-igwe-ikuku a na-akpọ brawụza nọkwa ugbua. Yunikod(Unicode) bụkwa nke a na-ahụta n’ime ngwa-ahịa dị iche iche ndị ọzọ mepụtara. Mpụta na ngosịpụta Ihu-ọkọlọtọ Yunikod(Unicode) na nkwado enyere ya tụmadụ ụdị nka dị iche iche na-anọnyere ya, bụ nnọ ihe ahụtara anya, nwekwara isi n'ime ọgan'iru teknọlọji n'ime ụwa dum ugbua. Emee ka Yunikod(Unicode) soro kwalite klayent-sava teknọlọji ma ọ bụ n'ime ka nka-ụzụ-igwe dị iche iche na akwụkwọ-ikuku ndị nọ n'elu ụwa soro kwado ọkọlọtọ a, ọ ga-abara onye ọ bụla uru, mee ka ego dịrị onye ọ bụla mfe. Ọ ga emekwa ka oge ghara ịla n'iyi ebe a na-eche iwere atụmatụ mkpụrụ-okwu emebere n'oge gara aga wee mepụta ihe. Yunikod(Unicode) na-eme ka nka-ụzụ-igwe (sọftwee) komputa ọbụla enwere ma ọ bụ ka akwụkwọ-ikuku enwere dị mfe n'imepee na n'ime asụsụ dum mba elu ụwa nwere, na-emeghị ha mgbuka ma ọ bụ mnwogharị ọbụla. Yunikod(Unicode) na-emekwa ka ahịrị-okwu dum siri n'otu ebe gafee n'ebe nke ọzọ; site na igwe nke a laa n'igwe nke ọzọ na-enweghị ihe mmebi ma ọ bụ mbibi mere ha.

Ozi banyere Otu ndị-ọrụ Yunikod(Unicode)

Otu ndị-ọrụ Yinikodu (Unicode) so n'ime ọgbakọ ndị na-akwado ọgan'ihu ụmụ-ụwa. Ọbụghị n'ihi ego ka ha jiri malite. Ha na-agbasi mbọ ike ime ka ụwa dum kwado ọkọlọtọ Yunikod(Unicode), werekwa ya mepụtawa ihe. Ha na-emekwa ka oziọma ogan'ihu Yunikod(Unicode) gbasaa. Yunikod(Unicode) bụ ọkọlọtọ na atụmatụ emepụtara na-akọwapụta ụzọ mkpụrụ-okwu na ahịrị-okwu dị iche iche ga-esi nọrọ n'elu nka-n'igwe na n'elu ngwa-ahịa ụmụ ụwa, nakwa n'ime atụmatụ-okwu ha dum. Ndị nọ n'ime otu-ọlụ Yunikod(Unicode) nwere ndị na-anọchite anya ha n'ime ụlọ-ọrụ na ọgbakọ dị iche iche na-arụ ihe gbasara kọmputa. Ha nọkwa n'ime ọgbakọ dị iche iche na-akpa ihe maka nhazi-ozi na mgbasa-okwu. Ndị-ọrụ Yunikod(Unicode) na-enweta nkwado ha site n'aka ndị na-enye ha ego kwa mgbe kwa mgbe. Ha na-anọkọtakwa ụtụ baa n'aha ndị na-esonye ha na-arụ ọrụ a. Otu a ka ha si enweta nkwado ha. Nnọnye ma ọ bụ ọnọdụ n'ime otu-ọrụ Yunikod(Unicode) bụ ihe gheere oghe nye onye ọbụla: ndị otu dị iche iche nakwa mmadụ ha n'elu ụwa dum ndị hụtara Yunikod(Unicode) dịka ezi ọkọlọtọ. Ha na-achọ kwa ka atụmatụ a gaa n'iru n'imepecha ụzụ-nka ndị fọdụrụ nakwa ngwa-ahịa ọzọ fọdụrụ. Mmadụ dum bụ ndị ana-rịọ ka ha sonye mee ka ọrụ otu Yunikod(Unicode) ga n'iru site n’inye onyinye ego ka ọrụa dịkasịrị mkpa kwudosie ike. Ị chọọrọ ka ịmụtakwuo ihe banyere ihe ndịa, biko lenye anya na Glọsarị, ozi banyere teknọlọjị na ụfọdị ozi na mmụta ndị ọzọ bara uru.

translation by Robert Ụnawụnwa Kelechi Isiodu